Jenesis 7:22
Genesis 7:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ.
Genesis 7:22 in English
Genesis 7:22 · Berean Standard Bible
Of all that was on dry land, everything that had the breath of life in its nostrils died.
Context
20Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa. 21Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile. 22Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ. 23Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ. 24Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.