Jenesis 7:21
Genesis 7:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.
Genesis 7:21 in English
Genesis 7:21 · Berean Standard Bible
And every living thing that moved upon the earth perished—birds, livestock, animals, every creature that swarms upon the earth, and all mankind.
Context
19Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe. 20Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa. 21Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile. 22Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ. 23Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.