Native Bible

Genesis 44:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’

Genesis 44:20 in English

Genesis 44:20 · Berean Standard Bible

And we answered, ‘We have an elderly father and a younger brother, the child of his old age. The boy’s brother is dead. He is the only one of his mother’s sons left, and his father loves him.’

Context

18Juda jekwuuru ya, sị, “Biko, onyenwe m, kwere ka ohu gị gwa gị okwu. Ewesola mụ bụ ohu gị iwe nʼihi na ị nọ ọnọdụ dị ka Fero. 19Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’ 20Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’ 21“Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’ 22Ma anyị gwara onyenwe m sị na ‘Nwata a apụghị ịhapụ nna ya, nʼihi na nna ya ga-anwụ ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.