Jenesis 44:21
Genesis 44:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’
Genesis 44:21 in English
Genesis 44:21 · Berean Standard Bible
Then you told your servants, ‘Bring him down to me so that I can see him for myself.’
Context
19Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’ 20Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’ 21“Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’ 22Ma anyị gwara onyenwe m sị na ‘Nwata a apụghị ịhapụ nna ya, nʼihi na nna ya ga-anwụ ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya.’ 23Ma ị gwara ndị ohu gị sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m anya ọzọ, ma ọ bụrụ na nwanne unu a esoghị unu gbadata.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.