Jenesis 42:9
Genesis 42:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.”
Genesis 42:9 in English
Genesis 42:9 · Berean Standard Bible
Joseph remembered his dreams about them and said, “You are spies! You have come to see if our land is vulnerable.”
Context
7Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?”
Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.” 8Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ. 9Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.” 10Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri. 11Anyị niile bụ ụmụ otu nna. Ndị ohu gị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Anyị abụghị ndị nnyopụta.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.