Jenesis 42:8
Genesis 42:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ.
Genesis 42:8 in English
Genesis 42:8 · Berean Standard Bible
Although Joseph recognized his brothers, they did not recognize him.
Context
6Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef. 7Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?”
Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.” 8Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ. 9Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.” 10Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.