Native Bible

Genesis 42:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka.

Genesis 42:3 in English

Genesis 42:3 · Berean Standard Bible

So ten of Joseph’s brothers went down to buy grain from Egypt.

Context

1Ugbu a, Jekọb nụrụ na ọka dị nʼIjipt. Ọ sịrị ụmụ ya, “Kedụ ihe anyị jiri nọrọ na-elerịta onwe anyị anya” 2Ọ sịrị, “Lee anụrụ m na ọka dị nʼIjipt. Gbadatanụ nʼebe ahụ zụtara anyị ọka ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ.” 3Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka. 4Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya. 5Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.