Jenesis 4:20
Genesis 4:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu.
Genesis 4:20 in English
Genesis 4:20 · Berean Standard Bible
Adah gave birth to Jabal; he was the father of those who dwell in tents and raise livestock.
Context
18Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek. 19Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila. 20Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu. 21Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi. 22Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.