Jenesis 37:29
Genesis 37:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya.
Genesis 37:29 in English
Genesis 37:29 · Berean Standard Bible
When Reuben returned to the pit and saw that Joseph was not there, he tore his clothes,
Context
27Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị. 28Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt. 29Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya. 30O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?” 31Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.