Jenesis 36:12
Genesis 36:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
Genesis 36:12 in English
Genesis 36:12 · Berean Standard Bible
Additionally, Timna, a concubine of Esau’s son Eliphaz, gave birth to Amalek. These are the grandsons of Esau’s wife Adah.
Context
10Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara.
Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ. 11Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ,
Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz. 12Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ. 13Ụmụ ndị ikom Reuel bụ,
Nahat, Zera, Shama na Miza. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ. 14Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ. Oholibama bụ nwa Ana na nwa nwa Zibiọn. Ọ mụtaara Ịsọ
Jeush, Jalam na Kora.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.