Native Bible

Genesis 34:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị.

Genesis 34:9 in English

Genesis 34:9 · Berean Standard Bible

Intermarry with us; give us your daughters, and take our daughters for yourselves.

Context

7Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme. 8Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya. 9Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị. 10Unu nwere ike biri nʼetiti anyị. Ala a ghere oghe nye unu. Birinụ nʼime ya, na-azụkwanụ ahịa nʼime ya, nwekwanụ akụ nʼime ya nye onwe unu.” 11Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.