Native Bible

Genesis 31:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso.

Genesis 31:49 in English

Genesis 31:49 · Berean Standard Bible

It was also called Mizpah,* because Laban said, “May the LORD keep watch between you and me when we are absent from each other.

Context

47Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya. 48Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed. 49A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso. 50Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.” 51Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.