Native Bible

Genesis 25:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso.

Genesis 25:6 in English

Genesis 25:6 · Berean Standard Bible

But while he was still alive, Abraham gave gifts to the sons of his concubines and sent them away from his son Isaac to the land of the east.

Context

4Ụmụ ndị ikom Midian bụ Efaa, Efe, Hanok, Abida, na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ Ketura. 5Ebraham nyere Aịzik ihe niile o nwere. 6Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso. 7Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise. 8Ebraham kubiri ume ndụ nwụọ mgbe o mere nnọọ ezigbo agadi, agadi nwoke nke ndụ juru afọ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.