Jenesis 24:58
Genesis 24:58 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere ha kpọrọ Ribeka jụọ ya sị, “Ị ga-eso nwoke a gaa?” Ọ zara sị, “E, aga m aga.”
Genesis 24:58 in English
Genesis 24:58 · Berean Standard Bible
They called Rebekah and asked her, “Will you go with this man?” “I will go,” she replied.
Context
56Ma ọ zara ha sị, “Unu egbochila anyị. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị emeela ka ije m bụrụ ihe gara nke ọma, zilaga m ka m laghachikwuru nna m ukwu.” 57Ha zara sị ya, “Ka anyị kpọọ nwantakịrị nwanyị ahụ jụọ ya ihe bụ uche ya.” 58Ya mere ha kpọrọ Ribeka jụọ ya sị, “Ị ga-eso nwoke a gaa?”
Ọ zara sị, “E, aga m aga.” 59Ya mere, ha zipụrụ nwanne ha nwanyị Ribeka, tinyere nwanyị lekọtara ya anya mgbe ọ dị na nwantakịrị, na ohu Ebraham na ndị ikom so ya. 60Ha gọziri Ribeka sị ya,
“Nwanne anyị nwanyị mụọ ọmụmụ,
mụruo puku kwụrụ puku,
ka mkpụrụ afọ gị nwetara onwe ha,
ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.