Jenesis 24:60
Genesis 24:60 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha gọziri Ribeka sị ya, “Nwanne anyị nwanyị mụọ ọmụmụ, mụruo puku kwụrụ puku, ka mkpụrụ afọ gị nwetara onwe ha, ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.”
Genesis 24:60 in English
Genesis 24:60 · Berean Standard Bible
And they blessed Rebekah and said to her, “Our sister, may you become the mother of thousands upon thousands. May your offspring possess the gates of their enemies.”
Context
58Ya mere ha kpọrọ Ribeka jụọ ya sị, “Ị ga-eso nwoke a gaa?”
Ọ zara sị, “E, aga m aga.” 59Ya mere, ha zipụrụ nwanne ha nwanyị Ribeka, tinyere nwanyị lekọtara ya anya mgbe ọ dị na nwantakịrị, na ohu Ebraham na ndị ikom so ya. 60Ha gọziri Ribeka sị ya,
“Nwanne anyị nwanyị mụọ ọmụmụ,
mụruo puku kwụrụ puku,
ka mkpụrụ afọ gị nwetara onwe ha,
ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.” 61Ribeka biliri, ya na ndị inyom na-ejere ya ozi, ha rigoro nʼelu ịnyịnya kamel ndị ahụ, soro nwoke ahụ. Ya mere, ohu ahụ duuru Ribeka laa. 62Nʼoge a, Aịzik bịara nʼebe mbata obodo Bịa-Lahai-Rọị nʼihi na o bi na Negev.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.