Jenesis 24:39
Genesis 24:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ahụ, ajụrụ m nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwanyị ahụ ekweghị iso m lọghachi?’
Genesis 24:39 in English
Genesis 24:39 · Berean Standard Bible
Then I asked my master, ‘What if the woman will not come back with me?’
Context
37Nna m ukwu mere ka m ṅụọra ya iyi sị, ‘Ị gaghị esite nʼetiti ụmụ ndị inyom Kenan ndị anyị bi nʼala ha lụtara nwa m nwoke nwunye. 38Kama ị ga-aga nʼezinaụlọ nna m, na nke ndị ikwu m chọtara nwa m nwoke nwunye.’ 39“Mgbe ahụ, ajụrụ m nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwanyị ahụ ekweghị iso m lọghachi?’ 40“Ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị, onye m na-ejegharị nʼihu ya, ga-eziga mmụọ ozi ya ka o soro gị gaa ime ka ije gị nwee isi, ka i nwee ike chọtara nwa m nwoke nwanyị site nʼetiti ndị ikwu m na ezinaụlọ nna m. 41Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ ma ọ bụrụ na mgbe i gakwuru ndị ikwu m, ha jụrụ ịkpọnye gị nwanyị ahụ. Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ m.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.