Jenesis 24:41
Genesis 24:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ ma ọ bụrụ na mgbe i gakwuru ndị ikwu m, ha jụrụ ịkpọnye gị nwanyị ahụ. Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ m.’
Genesis 24:41 in English
Genesis 24:41 · Berean Standard Bible
And when you go to my kindred, if they refuse to give her to you, then you will be released from my oath.’
Context
39“Mgbe ahụ, ajụrụ m nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwanyị ahụ ekweghị iso m lọghachi?’ 40“Ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị, onye m na-ejegharị nʼihu ya, ga-eziga mmụọ ozi ya ka o soro gị gaa ime ka ije gị nwee isi, ka i nwee ike chọtara nwa m nwoke nwanyị site nʼetiti ndị ikwu m na ezinaụlọ nna m. 41Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ ma ọ bụrụ na mgbe i gakwuru ndị ikwu m, ha jụrụ ịkpọnye gị nwanyị ahụ. Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ m.’ 42“Mgbe m rutere nʼisi iyi mmiri taa, ekwuru m sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna m ukwu Ebraham, ọ bụrụ na ọ masị gị, biko mee ka ije a m bịara bụrụ nke ga-aga nke ọma. 43Lee, ka m na-eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ka nwaagbọghọ ahụ bịara ikuru mmiri nke m ga-asị, “Biko kwere ka m si nʼite gị ṅụrụtụ ntakịrị mmiri,”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.