Jenesis 20:15
Genesis 20:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abimelek sịrị, “Lee nʼala m niile, birikwa nʼebe ọbụla masịrị gị.”
Genesis 20:15 in English
Genesis 20:15 · Berean Standard Bible
And Abimelech said, “Look, my land is before you. Settle wherever you please.”
Context
13Mgbe Chineke sitere nʼezinaụlọ nna m zipụ m ije ebe dị anya, agwara m ya sị, ‘Otu a ka ị ga-esi gosi na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọbụla anyị gara, kwuo gbasara m, “Onye a bụ nwanne m.” ’ ” 14Mgbe ahụ, Abimelek dupụtara atụrụ, na ehi, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom, nye Ebraham. Ọ kpọnyekwara ya Sera nwunye ya. 15Abimelek sịrị, “Lee nʼala m niile, birikwa nʼebe ọbụla masịrị gị.” 16Mgbe ahụ, ọ sịrị Sera, “Ana m enye nwanne gị puku shekel ọlaọcha, ka ọ bụrụ ihe m ji kwụọ ụgwọ mmeso ọjọọ m mesoro gị. Ejikwa m ya na-egosi na ị bụ onye aka ya dị ọcha.” 17Mgbe ahụ, Ebraham kpọkuru Chineke nʼekpere. Chineke gwọrọ Abimelek na nwunye ya, na ndị inyom ndị ohu ya niile, ka ha nwee ike ịmụta ụmụ ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.