Native Bible

Genesis 19:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Lọt rutere obodo Zoa, anwụ awalitela nʼala ahụ.

Genesis 19:23 in English

Genesis 19:23 · Berean Standard Bible

And by the time the sun had risen over the land, Lot had reached Zoar.

Context

21Ọ zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m emere gị dịka arịrịọ gị si dị. Agaghị m emebi obodo nta ahụ. 22Ma mee ngwangwa, nʼihi na o nweghị ihe ọbụla m ga-eme tutu ruo mgbe i ruru nʼebe ahụ.” (Ọ bụ nke a mere e ji akpọ aha obodo ahụ Zoa.) 23Mgbe Lọt rutere obodo Zoa, anwụ awalitela nʼala ahụ. 24Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke Onyenwe anyị mere ka o si nʼeluigwe zoo. 25Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.