Native Bible

Genesis 16:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua,

Genesis 16:7 in English

Genesis 16:7 · Berean Standard Bible

Now the angel * of the LORD found Hagar by a spring of water in the desert—the spring along the road to Shur.

Context

5Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.” 6Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ. 7Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua, 8jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?” Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.” 9Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.