Jenesis 16:8
Genesis 16:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?” Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.”
Genesis 16:8 in English
Genesis 16:8 · Berean Standard Bible
“Hagar, servant of Sarai,” he said, “where have you come from, and where are you going?” “I am running away from my mistress Sarai,” she replied.
Context
6Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ. 7Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua, 8jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?”
Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.” 9Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.” 10Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.