Jenesis 14:6
Genesis 14:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara.
Genesis 14:6 in English
Genesis 14:6 · Berean Standard Bible
and the Horites in the area of Mount Seir, as far as El-paran, which is near the desert.
Context
4Ha fere ofufe nʼokpuru ọchịchị eze Kedoloma afọ iri na abụọ, ma nʼafọ nke iri na atọ, ha nupuru isi. 5Nʼafọ nke iri na anọ, eze Kedoloma na ndị eze ya na ha jikọrọ ọnụ buru agha megide ma merie ndị Refaim* bi nʼAshterọt Kenaim na ndị Zuzim bi na Ham na ndị Emim bi Kiriatem na Shave, 6na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara. 7Mgbe ahụ, ha chigharịrị azụ gaa En Mishpat (ya bụ Kadesh). Ha meriri ala niile nke ndị Amalek nakwa ndị Amọrait bi na Hazezọn Tama. 8Mgbe ahụ kwa, ndị agha ndị eze obodo Sọdọm na eze Gọmọra, na eze Adma, na eze Zeboiim, na eze Bela (ya bụ Zoa) pụrụ doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Sidim,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.