Native Bible

Genesis 14:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ kwa, ndị agha ndị eze obodo Sọdọm na eze Gọmọra, na eze Adma, na eze Zeboiim, na eze Bela (ya bụ Zoa) pụrụ doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Sidim,

Genesis 14:8 in English

Genesis 14:8 · Berean Standard Bible

Then the king of Sodom, the king of Gomorrah, the king of Admah, the king of Zeboiim, and the king of Bela (that is, Zoar) marched out and arrayed themselves for battle in the Valley of Siddim *

Context

6na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara. 7Mgbe ahụ, ha chigharịrị azụ gaa En Mishpat (ya bụ Kadesh). Ha meriri ala niile nke ndị Amalek nakwa ndị Amọrait bi na Hazezọn Tama. 8Mgbe ahụ kwa, ndị agha ndị eze obodo Sọdọm na eze Gọmọra, na eze Adma, na eze Zeboiim, na eze Bela (ya bụ Zoa) pụrụ doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Sidim, 9imegide Kedoloma eze Elam, Tidal eze Goiim, Amrafel eze Shaịna na Ariok eze Elasa. Ya bụ eze ise buru agha megide eze anọ. 10Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.