Native Bible

Genesis 13:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.

Genesis 13:5 in English

Genesis 13:5 · Berean Standard Bible

Now Lot, who was traveling with Abram, also had flocks and herds and tents.

Context

3Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ. 4Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị. 5Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu. 6Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ. 7Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.