Native Bible

Genesis 13:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.

Genesis 13:3 in English

Genesis 13:3 · Berean Standard Bible

From the Negev he journeyed from place to place toward Bethel, until he came to the place between Bethel and Ai where his tent had formerly been pitched,

Context

1Ebram na nwunye, na ihe niile ha nwere hapụrụ ala Ijipt, gaa ije bịaruo Negev. Lọt sokwa ha. 2Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo. 3Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ. 4Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị. 5Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.