Jenesis 11:4
Genesis 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.”
Genesis 11:4 in English
Genesis 11:4 · Berean Standard Bible
“Come,” they said, “let us build for ourselves a city with a tower that reaches to the heavens, that we may make a name for ourselves and not be scattered over the face of all the earth.”
Context
2Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ. 3Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik,* kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ. 4Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.” 5Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu. 6Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.