Jenesis 10:31
Genesis 10:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
Genesis 10:31 in English
Genesis 10:31 · Berean Standard Bible
These are the sons of Shem, according to their clans, languages, lands, and nations.
Context
29Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan. 30Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ. 31Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche. 32Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.
10:6 Kush na-ekwu banyere ala dị nʼugwu ugwu Naịl, nʼala Itiopia, nakwa ala Sụdan. Mizraim bụ maka ndị Ijipt, ebe Put na-ekwu banyere ndị Libiya, maọbụ ndị bi gburugburu ala Sọmalia.
10:7 Ọ bụ nʼime ala Arab ka mba asaa ndị Kush dị.
10:10 Maọbụ, Babilọn
10:10 Shaịna bụ ala Babilọn ochie.
10:14 Ndị Filistia bụ mba si nʼagbụrụ (agwara ụgwa) abụọ, otu agbụrụ sitere nʼEshịa, ebe nke ọzọ bụ agbụrụ ndị Ọcha. Njem mbụ ha duuru ha gaa ala Kriit, ebe ha gara biri. Jer 47:4; Ems 9:7 Emesịa, ha busoro ndị Ijipt agha na senchuri nke iri na atọ, ma bichie ala ha. Mgbe e sitere nʼala Ijipt chụpụ ha, ha gara biri nʼakụkụ ọnụ mmiri ala Kenan.
10:22 Aha ochie e ji mara Asịrịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.