Ndị Galeshịa 2:3
Galatians 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik.
Galatians 2:3 in English
Galatians 2:3 · Berean Standard Bible
Yet not even Titus, who was with me, was compelled to be circumcised, even though he was a Greek.
Context
1Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee. 2Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu. 3Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik. 4Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu. 5Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.