Ndị Galeshịa 2:4
Galatians 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.
Galatians 2:4 in English
Galatians 2:4 · Berean Standard Bible
This issue arose because some false brothers had come in under false pretenses to spy on our freedom in Christ Jesus, in order to enslave us.
Context
2Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu. 3Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik. 4Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu. 5Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu. 6Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.