Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem.

Ezra 7:15 in English

Ezra 7:15 · Berean Standard Bible

Moreover, you are to take with you the silver and gold that the king and his counselors have freely offered to the God of Israel, whose dwelling is in Jerusalem,

Context

13Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga. 14Eze na mmadụ asaa ndị na-adụ ya ọdụ na-eziga gị Juda na Jerusalem ka ị gaa leba anya nʼiwu Chineke nke dị gị nʼaka. 15Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem. 16Tinyere ọlaedo na ọlaọcha nke i nwere ike ịnata nʼala ahụ niile nʼakụkụ niile nke Babilọn, tinyekwara onyinye ihuọma si nʼaka ndị mmadụ, na ndị nchụaja niile, maka ụlọnsọ ukwu Chineke ha dị na Jerusalem. 17Ị ga-eji ego niile ndị a zụọ oke ehi, na ebule, na atụrụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ, e ji achụ aja nʼebe ịchụ aja nke ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.