Ezra 7:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga.
Ezra 7:13 in English
Ezra 7:13 · Berean Standard Bible
I hereby decree that any volunteers among the Israelites in my kingdom, including the priests and Levites, may go up with you to Jerusalem.
Context
11Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke Onyenwe anyị nyere Izrel: 12Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ,
na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe.
Ndeewo! 13Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga. 14Eze na mmadụ asaa ndị na-adụ ya ọdụ na-eziga gị Juda na Jerusalem ka ị gaa leba anya nʼiwu Chineke nke dị gị nʼaka. 15Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.