Ezra 6:1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ.
Ezra 6:1 in English
Ezra 6:1 · Berean Standard Bible
Thus King Darius ordered a search of the archives stored in the treasury of Babylon.
Context
1Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ. 2Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ:
Akwụkwọ ozi eze; 3Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke.
A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.