Ezra 6:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ.
Ezra 6:3 in English
Ezra 6:3 · Berean Standard Bible
In the first year of King Cyrus, he issued a decree concerning the house of God in Jerusalem: Let the house be rebuilt as a place for offering sacrifices, and let its foundations be firmly laid. It is to be sixty cubits high and sixty cubits wide,*
Context
1Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ. 2Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ:
Akwụkwọ ozi eze; 3Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke.
A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ. 4Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile. 5Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.