Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?

Ezra 5:9 in English

Ezra 5:9 · Berean Standard Bible

So we questioned the elders and asked, “Who authorized you to rebuild this temple and restore this structure?”

Context

7Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee, Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a, Anyị ekelee gị. 8Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha. 9Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem? 10Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha. 11Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị: “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.