Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha.

Ezra 5:10 in English

Ezra 5:10 · Berean Standard Bible

We also asked for their names, so that we could write down the names of their leaders * for your information.

Context

8Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha. 9Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem? 10Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha. 11Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị: “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga. 12Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.