Ezra 5:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn.
Ezra 5:12 in English
Ezra 5:12 · Berean Standard Bible
But since our fathers angered the God of heaven, He delivered them into the hand of Nebuchadnezzar king of Babylon, the Chaldean who destroyed this temple and carried away the people to Babylon.
Context
10Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha. 11Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị:
“Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga. 12Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn. 13“Ma otu ọ dị, nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Babilọn, eze Sairọs nyere iwu ka e wugharịa ụlọnsọ Chineke a. 14O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.