Ezra 10:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.
Ezra 10:18 in English
Ezra 10:18 · Berean Standard Bible
Among the descendants of the priests who had married foreign women were found these descendants of Jeshua son of Jozadak * and his brothers: Maaseiah, Eliezer, Jarib, and Gedaliah.
Context
16Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a. 17Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ. 18A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ.
Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ,
Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya. 19Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma. 20Ndị si nʼikwu Imea bụ
Hanani, na Zebadaya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.