Native Bible

Ezekiel 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị.

Ezekiel 5:3 in English

Ezekiel 5:3 · Berean Standard Bible

But you are to take a few strands of hair and secure them in the folds of your garment.

Context

1“Ma gị, nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ dịka agụba onye ọkpụisi, kpụchaa isi gị na afụọnụ gị; werekwa ihe e ji atụ ihe ọtụtụ tụọ agịrị isi gị, ka ụzọ ọbụla hara nʼotu. 2Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha. 3Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị. 4Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile. 5“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.