Native Bible

Ezekiel 44:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a.

Ezekiel 44:5 in English

Ezekiel 44:5 · Berean Standard Bible

The LORD said to me: “Son of man, pay attention; look carefully with your eyes and listen closely with your ears to everything I tell you concerning all the statutes and laws of the house of the LORD. Take careful note of the entrance to the temple, along with all the exits of the sanctuary.

Context

3Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.” 4Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja. 5Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a. 6Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel! 7Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.