Native Bible

Ezekiel 44:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.

Ezekiel 44:4 in English

Ezekiel 44:4 · Berean Standard Bible

Then the man brought me to the front of the temple by way of the north gate. I looked and saw the glory of the LORD filling His temple, and I fell facedown.

Context

2Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi. 3Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.” 4Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja. 5Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a. 6Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.