Izikiel 44:18
Ezekiel 44:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha.
Ezekiel 44:18 in English
Ezekiel 44:18 · Berean Standard Bible
They are to wear linen turbans on their heads and linen undergarments around their waists. They must not wear anything that makes them perspire.
Context
16Ọ bụ naanị ha ga-abanye nʼime ebe nsọ m, naanị ha ga-abịakwa na tebul m ije ozi nʼihu m, na ife m dịka ndị nche. 17“ ‘Mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama nke ogige dị nʼime, ha ga-eyi naanị akwa ọcha. Ha agaghị eyi uwe ọbụla e ji ajị anụ kpaa mgbe ha na-eje ozi nʼogige ime nke ụlọnsọ ukwu m. 18Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha. 19Mgbe ha na-apụ nʼogige dị nʼezi ebe ndị mmadụ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha yi mgbe ha na-eje ozi, hapụkwa ha nʼime ọnụụlọ nsọ ndị a, yiri uwe ọzọ, ka ha ghara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị e doro nsọ site nʼimetụ uwe ha ahụ. 20“ ‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.