Izikiel 44:20
Ezekiel 44:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha.
Ezekiel 44:20 in English
Ezekiel 44:20 · Berean Standard Bible
They must not shave their heads or let their hair grow long, but must carefully trim their hair.
Context
18Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha. 19Mgbe ha na-apụ nʼogige dị nʼezi ebe ndị mmadụ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha yi mgbe ha na-eje ozi, hapụkwa ha nʼime ọnụụlọ nsọ ndị a, yiri uwe ọzọ, ka ha ghara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị e doro nsọ site nʼimetụ uwe ha ahụ. 20“ ‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha. 21Onye nchụaja ọbụla agaghị aṅụ mmanya vaịnị mgbe ọ na-abata nʼogige dị nʼime. 22Ha agaghị alụ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ, maọbụ nwanyị gbaara di ya alụkwaghị m. Kama ọ bụ naanị ụmụ agbọghọ ndị sitere nʼagbụrụ Izrel ndị na-amaghị nwoke, maọbụ nwunye ndị nchụaja nwụrụ anwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.