Izikiel 44:10
Ezekiel 44:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
Ezekiel 44:10 in English
Ezekiel 44:10 · Berean Standard Bible
Surely the Levites who wandered away from Me when Israel went astray, and who wandered away from Me after their idols, will bear the consequences of their iniquity.
Context
8Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m. 9Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel. 10“ ‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. 11Ha ga-abụ ndị na-eje ozi nʼime ebe nsọ m, ndị nlekọta nke ọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwuu, na-ejekwa ozi nʼime ya; ha ga-egburu ndị m anụ e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ na nke aja ndị ọzọ, ha ga-eguzokwa nʼihu ha jeere ha ozi. 12Ma nʼihi na ha guzoro nʼihu arụsị jeere ha ozi, mee ka ụlọ Izrel daba na mmehie ikpere arụsị,* nʼihi nke a, eweliela m aka elu na-aṅụ iyi na ha aghaghị ịta ahụhụ mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.