Native Bible

Ezekiel 44:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m.

Ezekiel 44:8 in English

Ezekiel 44:8 · Berean Standard Bible

And you have not kept charge of My holy things, but have appointed others to keep charge of My sanctuary for you.’

Context

6Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel! 7Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m. 8Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m. 9Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel. 10“ ‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.