Native Bible

Ezekiel 43:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita isii nʼogologo na mita isii nʼuhie, nwee akụkụ anọ nke ha nʼotu.

Ezekiel 43:16 in English

Ezekiel 43:16 · Berean Standard Bible

The altar hearth shall be square at its four corners, twelve cubits long and twelve cubits wide.*

Context

14Site nʼụkwụ ya nke dị nʼala ruo nʼokere ya nke etiti, ọ ga-adị otu mita nʼogologo nakwa nʼuhie; site nʼokere nke nta ruo na nke ukwu ga-adị mita abụọ nʼogologo na ọkara nʼuhie. 15Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo. 16Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita isii nʼogologo na mita isii nʼuhie, nwee akụkụ anọ nke ha nʼotu. 17Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.” 18Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị a bụ usoro metụtara iwu ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ifesa ọbara nʼelu ebe ịchụ aja mgbe e wusiri ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.