Izikiel 38:5
Ezekiel 38:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Peshịa na Itiopia,* na Put, ga-esonyere ha, ha niile ga-ejikwa ọta ha na okpu agha ha.
Ezekiel 38:5 in English
Ezekiel 38:5 · Berean Standard Bible
Persia, Cush,* and Put will accompany them, all with shields and helmets,
Context
3sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m edo onwe m imegide gị, Gog, eze ukwu ndị Meshek na Tubal. 4Aga m echigharị gị, tinye gị nko nʼagba gị abụọ, jiri ya kpụpụta gị na usuu ndị agha gị niile, na ịnyịnya gị, na ndị na-agba ịnyịnya gị na ihe agha ha, na usuu ndị agha gị niile, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ndị niile na-ejide mma agha ha. 5Peshịa na Itiopia,* na Put, ga-esonyere ha, ha niile ga-ejikwa ọta ha na okpu agha ha. 6Goma na usuu ndị agha ya niile, na ndị agha Bet Togama ndị si nʼakụkụ ugwu, dị ebe dị anya na ọtụtụ ndị mba ọzọ ga-eso gị. 7“ ‘Jikere! Jikere onwe gị, gị onwe gị na usuu ndị agha ahụ nọ gị gburugburu, gị Gog, bụrụkwa onyendu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.