Izikiel 38:6
Ezekiel 38:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Goma na usuu ndị agha ya niile, na ndị agha Bet Togama ndị si nʼakụkụ ugwu, dị ebe dị anya na ọtụtụ ndị mba ọzọ ga-eso gị.
Ezekiel 38:6 in English
Ezekiel 38:6 · Berean Standard Bible
as well as Gomer with all its troops, and Beth-togarmah from the far north with all its troops—the many nations with you.
Context
4Aga m echigharị gị, tinye gị nko nʼagba gị abụọ, jiri ya kpụpụta gị na usuu ndị agha gị niile, na ịnyịnya gị, na ndị na-agba ịnyịnya gị na ihe agha ha, na usuu ndị agha gị niile, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ndị niile na-ejide mma agha ha. 5Peshịa na Itiopia,* na Put, ga-esonyere ha, ha niile ga-ejikwa ọta ha na okpu agha ha. 6Goma na usuu ndị agha ya niile, na ndị agha Bet Togama ndị si nʼakụkụ ugwu, dị ebe dị anya na ọtụtụ ndị mba ọzọ ga-eso gị. 7“ ‘Jikere! Jikere onwe gị, gị onwe gị na usuu ndị agha ahụ nọ gị gburugburu, gị Gog, bụrụkwa onyendu ha. 8Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-akpọlite gị ibu agha. Nʼogologo oge dị nʼihu, ị ga-ebuso ala ahụ agha bụ ala ahụ na-enwetaghachi onwe ya site na mbibi nke ibu agha; ala ahụ e si na mba dị iche iche chịkọtaa ndị bi nʼime ya, mee ka ha birikwa nʼugwu niile nke Izrel ahụ naara atọgbọ nʼefu. E bulatara ha site na mba dị iche iche, ma ugbu a, ha anọrọla nʼudo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.