Native Bible

Ezekiel 38:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

Ezekiel 38:21 in English

Ezekiel 38:21 · Berean Standard Bible

And I will summon a sword against Gog on all My mountains, declares the Lord GOD, and every man’s sword will be against his brother.

Context

19Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ. 20Azụ niile dị nʼoke osimiri, na anụ ufe nke eluigwe, na anụ ọhịa, na ihe niile na-akpụ akpụ, na mmadụ niile nọ nʼelu ụwa ga-ama jijiji nʼihu m. A ga-akwatu ugwu niile, ebe niile dị mkputamkpu ga-adarukwa ala. 21Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 22Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ. 23Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 38:2 Ya bụ, Roshu 38:5 Maọbụ, Kush.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.