Izikiel 38:19
Ezekiel 38:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ.
Ezekiel 38:19 in English
Ezekiel 38:19 · Berean Standard Bible
In My zeal and fiery rage I proclaim that on that day there will be a great earthquake in the land of Israel.
Context
17“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m. 18Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 19Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ. 20Azụ niile dị nʼoke osimiri, na anụ ufe nke eluigwe, na anụ ọhịa, na ihe niile na-akpụ akpụ, na mmadụ niile nọ nʼelu ụwa ga-ama jijiji nʼihu m. A ga-akwatu ugwu niile, ebe niile dị mkputamkpu ga-adarukwa ala. 21Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.