Native Bible

Ezekiel 36:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼihi na ụfọdụ mba na-ekwutọ gị na-asị, “Ị bụ ala na-eri ụmụ ya, ala na-agbaba ndị ya aka ụmụ.”

Ezekiel 36:13 in English

Ezekiel 36:13 · Berean Standard Bible

For this is what the Lord GOD says: Because people say to you, ‘You devour men and deprive your nation of its children,’

Context

11Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 12Aga m eme ka ndị m, ndị m bụ Izrel, biri nʼime unu. Unu ga-abụ ihe nweta ha, unu ga-aghọkwara ha ihe nketa. Unu agakwaghị agbaba ha aka ụmụ ọzọ. 13“ ‘Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼihi na ụfọdụ mba na-ekwutọ gị na-asị, “Ị bụ ala na-eri ụmụ ya, ala na-agbaba ndị ya aka ụmụ.” 14Nʼihi nke a, ị gaghị erikwa mmadụ ọzọ. Ị gaghị agbawakwa mba gị aka ụmụ ọzọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 15Agaghị m emekwa ka ị nụrụ mkparị nke ndị mba ọzọ na-akparị gị. Ị gaghị anọkwa ọnọdụ nke ga-eme ka ndị mba ọzọ lelịa gị, maọbụ nọọ ọnọdụ nke ga-eme ka ị sọọ ngọngọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.